Proverbs 8

Ọkpụkpọ oku amamihe na-akpọ

1Ọ bụ na amamihe adịghị eti mkpu?
Ọ bụ na nghọta anaghị eme ka olu ya daa ụda?
2Ọ na-eguzo nʼelu ebe niile dị elu nʼokporoụzọ,
nʼagbata ụzọ niile.
3Nʼọnụ ụzọ nke obodo niile
na nʼọnụ ụzọ ụlọ niile ka ọ nọ na-eti mkpu,
4ọ na-asị, “Ụmụ mmadụ geenụ m ntị;
ọ bụ unu ndị dị ndụ ka m na-agwa okwu.
5Unu ndị na-enweghị uche, nweenụ uche zuruoke;
unu ndị nzuzu, nweenụ nghọta.
6Geenụ m ntị, nʼihi na enwere m okwu dị mkpa m ga-agwa unu;
Ihe ọbụla m kwuru bụ ihe ziri ezi,
7Ọnụ m na-ekwu eziokwu
nʼihi na akpọrọ m okwu ụgha asị.
8Ndụmọdụ m zuruoke, ọ dịkwa mma.
Ihe ọjọọ ọbụla adịghị nʼime ya.
9Nʼebe onye nwetara nghọta nọ, okwu m doro anya;
nʼebe ndị chọtara ihe ọmụma nọ, okwu m ziri ezi.
10Họrọ ịdọ aka na ntị m karịa ọlaọcha
họrọkwa ihe ọmụma karịa ọlaedo dị ezi mma.”
11Amamihe dị mkpa karịa nkume rubi dị oke ọnụahịa.
Ọ dịkwaghị ihe a ga-eji tụnyere ya.

12“Mụ onwe m bụ amamihe na ezi nghọta na-agakọta.
Enwere m ọmụma ihe na ezi izuzu.
13Ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ ịkpọ ihe ọjọọ asị.
Akpọrọ m nganga na mpako,
omume ọjọọ nakwa okwu gbagọrọ agbagọ asị.
14Ndụmọdụ na ezi nghọta bụ nke m;
enwekwara m ọmụma ihe na ike.
15Site na m ka ndị eze ji achị,
ọ bụ m na-eme ka ndị na-achị achị mee iwu ziri ezi.
16Site na m ka ndị eze ji achị
bụ ndịisi niile na-achị nʼụwa.
17Ndị niile hụrụ m nʼanya ka m na-ahụ nʼanya.
Ndị niile na-achọ m aghakwaghị ịchọta m.
18Ana m ekenye ụba na nsọpụrụ,
na ikpe ziri ezi na ezi omume.
19Onyinye m na-enye dị mma karịa ọlaọcha,
ọ karịkwara ọlaedo.
20Ana m aga ije nʼụzọ ezi omume,
nʼokporoụzọ ikpe ziri ezi.
21Ndị niile hụrụ m nʼanya, na-eketa akụnụba.
Ana m emejupụtakwa ụlọakụ ha.

22Onyenwe anyị kpụrụ m dịka mmalite ụzọ ya,
tupu o bido ike ihe ọbụla ọzọ.
23Site nʼebighị ebi gara aga ka m dị;
adịkwa m adị tupu e kee ụwa.
24Anọ m na-adị tupu e kee ogbu mmiri,
tupu isi iyi ọbụla agbapụta mmiri nʼelu ụwa,
25tupu e kee ugwu ukwu
na ugwu nta.
26E, amụọla m rịị tupu Chineke ekee ụwa
na osisi niile, na aja niile dị nʼime ya.
27Anọ m ya mgbe o doziri mbara eluigwe nʼọnọdụ ya,
mgbe ọ tụsara ha nʼelu ogbu mmiri niile;
28mgbe o hiwere mbara eluigwe,
mgbe o mere ka isi iyi niile nke ogbu mmiri dị ike,
29mgbe ọ kpara oke nye osimiri ebe ọ ga-akwụsị,
ka mmiri ya ghara ịgafe iwu ya,
mgbe ọ kara akara ebe a tọrọ ntọala nke ụwa.
30Oge ahụ niile ka m na-anọ nʼakụkụ ya dịka onye ǹka.
Ihe banyere m na-atọkwa ya ụtọ;
ana m egwuri egwu nʼihu ya.
31Ihe niile o kere tọkwara m ụtọ,
ụwa niile na ụmụ mmadụ!

32“Nʼihi ya, ụmụ m ndị ikom, geenụ m ntị;
nʼihi na ndị niile na-eso ụzọ m na-enwe ọṅụ.
33Gee ntị na ndụmọdụ m ka ị bụrụ onye maara ihe,
agbakụtakwala ndụmọdụ m azụ.
34Ngọzị dịrị mmadụ ahụ na-aṅa ntị nʼokwu m,
onye na-anọ na nche nʼọnụ ụzọ m ụbọchị niile,
onye na-anọ na-echere m nʼọnụ ụzọ ụlọ m;
35nʼihi na onye ọbụla chọtara m chọtara ndụ;
ọ natakwala ihuọma nʼebe Onyenwe anyị nọ.
36Ma onye na-enweghị ike chọta m na-emerụ onwe ya ahụ;
ndị niile kpọrọ m asị hụrụ ọnwụ nʼanya.”
Copyright information for IboBIU